Psalms 78

Abụ maskil nke Asaf.

Chineke na ndị ya

1Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi;
geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
2Aga m eji ilu malite okwu m,
aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,
ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,
mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,
bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,
ka ha kuziere ụmụ ha,
6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,
ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,
ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,
ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche.
Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha,
ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike;
ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ,
ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.

9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha,
chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
10Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke.
Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
11Ha chefuru ihe o mere,
ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
12Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha
nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
13O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha.
O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
14O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie,
jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
15Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara,
si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta,
mee ka mmiri rudata dịka osimiri.

17Ha nọgidere na-emehie megide ya.
Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa,
mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
19Ha kwuhiere Chineke;
jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị
ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
20Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe,
mee ka mmiri sọpụta,
mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne,
ma ọ pụrụ inye anyị nri?
Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”
21Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya;
ọkụ ya repịara Jekọb,
iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
22Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke,
maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu
meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie.
O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi.
O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ,
o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu,
anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.
28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha
nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.
29Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ,
nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
30Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ,
anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
31mgbe iwe Chineke biliri imegide ha;
o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha,
tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.

32Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha,
jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
33O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu.
O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya;
ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha,
na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe,
were ire ha na-aghara ya ụgha.
37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya.
Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
38Ma o meere ha ebere.
Ọ gbaghara ha mmehie ha.
Ọ laghị ha nʼiyi.
Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya.
Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,
chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.

40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara;
ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke;
ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
42Ha echetaghị ike ya,
ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
43nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt,
ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.
44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara.
Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.
45O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha,
zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.
46O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha,
zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha,
jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.
48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri,
werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
49O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha,
oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya,
ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.
50O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso;
o gbochighị ka ha ghara ịnwụ;
kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
51O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt,
mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
52Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ;
o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha,
ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya,
ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha,
tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa;
o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.

56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa,
nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu;
ha edebeghị ụkpụrụ ya.
57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ,
ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya;
sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu.
Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo
Shaịlo dị nʼoke ala ebo Ifrem, nʼetiti Betel na Shekem. Ọ bụ ala nsọ ochie nʼoge Joshua, ebe ụmụ Izrel dọbara igbe ọgbụgba ndụ ahụ tutu ruo nʼoge Samuel. Ma ndị Filistia mesịrị bibie obodo a.
azụ,
ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha,
o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.
62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha;
iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.
63Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha,
ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;
64E gburu ndị nchụaja ha nʼagha;
ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.

65Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta,
dịka dike si nʼụra mmanya teta.
66Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ,
mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.
67Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef,
ọ họpụtaghị ebo Ifrem;
68ma ọ họọrọ ebo Juda,
na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.
69O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu,
dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
70Ọ họpụtara Devid, ohu ya,
kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ;
71o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya,
ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb,
na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ.
72Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha,
aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.
Copyright information for IboBIU